Search This Blog

Translate

The King James Bible

The King James Bible
Your Very Own King James Bible

Ihe Ikwu Ka A Zoputa


Ndị Rom

Isi nke 10


9 na ọ buru na i gēwere ọnu-gi kwuputa Onye-nwe-ayi Jisus, ma i kwere na obi-gi na Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, agāzọputa gi.



Ndị Rom

Isi nke 10

1 Ụmụnna, ọchịchọ m na ekpere m nye Chineke maka Israel bụ, ka e wee zọpụta ha.



2 N'ihi na ana m agbara ha àmà na ha na-anụ ọkụ n'obi n'ebe Chineke nọ, ma ọ bụghị dị ka ihe ọmụma si dị.



3 N'ihi na, ebe ha nāmataghi ezi omume Chineke, ha nāchọ kwa ime ka ezi omume-ha guzosie ike, ha adighi-edo onwe-ha n'okpuru ezi omume Chineke.



4 N'ihi na Kraist bu njedebe nke iwu nye ezi omume nye onye ọ bula nke kwere.



5 N'ihi na Moses nēkọwa ezi omume nke iwu ahu, na onye nēme ihe ndia gādi ndu site na ha.



Ma ezi omume nke sitere n'okwukwe nēkwu okwu bayere nka, si, Esila n'obi-gi, Ònye gārigo n'elu-igwe? (ya bu, ime ka Kraist si n'elu bia).



7 Ma-ọbu, Ònye gārida n'oké miri? (ya bu, ime ka Kraist si na ndi nwuru anwu bilie.)



Ma gini ka ọ nēkwu? Okwu ahu di gi nso, ọbuná n'ọnu-gi, na n'obi-gi: nke ahu bu okwu okwukwe, nke ayi nēkwusa;



9 na ọ buru na i gēwere ọnu-gi kwuputa Onye-nwe-ayi Jisus, ma i kwere na obi-gi na Chineke mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie, agāzọputa gi.



10 N'ihi na obi mmad® kwere na ezi omume; ma site na nkwuputa ka ekwuputaworo nz] p ta.



N'ihi na edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye ọ bula nke kwere na Ya, ihere agaghi-eme ya.



12 N'ihi na ọ dighi ihe di iche n'etiti onye-Ju na onye Grik: n'ihi na Onye-nwe-ayi ahu bu ọgaranya nye ndi nile nākpọku Ya.



13 N'ihi na onye ọ bula nke ha gākpọku aha Onye-nwe ka agāzọputa ya.



14 Oleezi otú ha ga-esi kpọkuo onye ha na-ekweghị na ya? Olee otú ha ga-esi kwere n'onye ha na-anụbeghị? Kedu ka ha ga-esi anụ ma ọ bụrụ na ha enweghị onye nkwusa?



15 Ma olee otu ha ga-esi kwusaa, ma ™ b®gh∫ na a zitere ha? dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Le, ukwu nke ndi nēkwusa ozi ọma nke udo, bú ndi nēkwusa ozi ọma;



16 Ma ha erubeghi isi na ozioma. N'ihi na Aisaia siri, Onye-nwe-ayi, ònye kwereworo okwu-ayi?



17 Ya mere, okwukwe sitere n'ịnụ ihe, nụkwa site n'okwu Chineke.



18 Ma asim, Ha anughi? N'ezie, olu-ha abiawo n'uwa nile, okwu-ha we rue nsọtu uwa.



19 Ma asim, Israel amaghi? Moses buru uzọ si, M'gēme ka ekworo kpasue unu site na ndi nābughi ndi ọzọ: M'gēwere kwa mba di iche iche kpasuo unu iwe.



20 Ma Esaia siri ike, si, Achọtaram ndi nāchọghim; Emere m ka m pụta ìhè nye ndị jụrụ ajụ m.



21 Ma ọ siri Israel, Ubọchi nile ka M'setiworo akam abua nye ndi nēnweghi isi na ndi nēmebi iwu.